ỊZỌ IHE NA ANYA ỤFỤ DỊKA HA DỊ NA DIKE E GBURU N’AZỤ ỤLỌ: IHE ỊDỌ AKA NA NTỊ NYE ỤMỤ IGBO

Nnamdị Anị

Abstract


Agụmagụ ederede Igbo bụ otu ụzọ ndị odee na-esi egosịpụta n’ụzọ doro anya, ihe ndị na-emegasị na ndụ ndị Igbo n’oge gboo nakwa n’oge ugbu a. Edemede a lebara anya n’ọghọm na-apụta n’ịzọ ihe nakwa n’inwere mmadụ anya ụfụ n’iduuazị Igbo a họọrọ. Ndị Igbo bụ ndị e ji ibi n’udo mara. Ha na-ahụrịta onwe ha n’anya ma na-enyerịtara onwe ha aka. Nke a mere na e nweghị nkewa n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye n’oge gboo. Nke a ka ha na-eme site n’ịgbazinye mmadụ ihe dị ka ego, ala dg. Ụzọ dị otu a ka ha ji bụrụ ogbu ehi n’ụkọ anụ, maka na akụnaụba e ji ebi ndụ juru eju n’ala Igbo. E nweghị ihe dị ka ntaji anya n’etiti ha mgbe elu bụ ala ọsa. Ugbu a, ọnọdụ ahụ adịghịzị otu ọ dịbu na mbụ. Ndị mmadụ ugbu a, n’ihi oke ọchịchọ, anya ukwu, ụfụ anya na enweghị afọ ojuju, emeela ka a na-azọ ihe mmadụ nwe azọ. Nwanne anaghị ejizi anya ọma ahụ ihe nwanne ya nwere. Ọnọdụ ndị Igbo jizi azọ ihe ma na-enwekwa anya ụfụ n’ihe mmadụ nwe ugbu a, akpalitela ndị ọkammụta n’agụmagụ Igbo, ọkachasị ndị odee iduuazị Igbo, n’idepụta ọtụtụ ọghọm, na nsogbu dị iche iche dị n’inwe anya ụfụ nakwa n’ịzọ ihe. Nke a kpalitere mmụọ nwanchọcha ileba anya n’iduuazị ahụ e dere, ma zipụtara ọhanaeze, nsogbu dị iche iche na-esi n’ịzọ ihe nakwa anya ụfụ apụta. Edemede a jiri ihe e dere n’iduuazị a Dike E Gburu n’Azụ Ụlọ nke Akaa dere wee nweta ihe a na-achọ. Edemede a ji atụtụMarx ma gbasoro usoro nkọwasị wee zipụtachaa nsogbu ndị ahụ dịka ha pụtachara ihe n’iduuazị ahụ. Edemede a chọpụtara na a na-esite n’inwe anya ụfụ nakwa n’ịzọ ihe onye ọzọ nwe, gbuo, ma laa ndụ mmadụ n’iyi. A chọpụtakwara na a na-esite n’agwa ọjọọ a tọrọ ụmụaka, zuo ohi, ma kwaso ụmụnwaanyị erubeghị ihe e ji nwaanyị eme iko n’ike, nakwa nsogbu ndị ọzọ. Edemede a ga-abara ọhanaeze ndị Igbo uru n’ebe ọ dị ukwuu, maka na ndị niile na-enwe anya ụfụ; ma na-azọ ihe onye ọzọ nwe, nakwa ndị niile chọrọ itinye aka n’agwa ọjọọ a, ga-esite na nsogbu ndị ahụ e depụtara, chegharịa echiche, gbaso ibi n’udo nakwa inwe afọ ojuju n’ihe ha nwere.

Full Text:

PDF

References


Akaa, Ọ.Ụ. (2014). Dike E Gburu n’Azụ Ụlọ. Abakalili. Ụjaka Educational Publishers. Alagoa, E.J. (2001). “Conflict Resolution: The Nigeria Perspective”, KAIBARA: Journal of Humanities, vol 7, No.1, 2001 (pp8).

Udechukwu, G.I., Ogbuagu, J. O., Nnyigide, M. N. (2015). Ọmụmụ Agụmagụ na Omenaala Igbo. Enugu: Format Publishers.

Mbah, B. M. (2017). Theories of Conteṅtual Linguistics, Awka: Amaka Dreams.

Nwadike, I.U. (1990). Ntọala Agụmagụ, Nigeria: Ifunanya Publishers. Onyekaọnwụ, G.O. Mimeograph.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.