MKPA Ọ DỊ ỊZỤLITE ỤMỤAKA IGBO INWE EZIGBO AKPARAMAAGWA SITE N’ASỤSỤ IGBO

Peace-Val C. Eze, Apakama, Lucy Mgbemgasha

Abstract


Agwa ọjọọ bụzi okwu a kpụnọọnụ n’etiti ndị ntorobịa ugbu a. Ihe kpatara agwa ọjọọ ndị a sitere n’ọtụtụ ihe dị iche iche ma nchọpụta na-egosi na e jighị asụsụ nne azụ nwata so n’otu ihe na-ebute agwa ọjọọ ndị a karịchaa. Edereede a lebara anya n’uru iji asụsụ nne azụlite nwata bara. Ndị nchọcha mere nke a site n’inyocha edereede ndị ọzọ na ileru anya n’ihe ndị na-emegasị n’obodo taa. Nchọcha a bụ nke sọvee. O nweghị mgbakọ na mwepụ n’ime ya. Ndị odee chọpụtara na e jighị asụsụ ara nne azụlite nwata na-ebute ụfọdụ agwa ọjọọ n’ebe nwa ahụ nọ. Ọzọkwa, ọ na-eme ka asụsụ Igbo na-ala azụ. Ndị odee wee na-akwado ka ịsụ asụsụ Igbo bụrụ oke na ọrụ nne na nna n’ebe ụmụ ha nọ n’ezinaụlọ ndị Igbo dị iche iche.

Full Text:

PDF

References


Anizoba, O.M. (2013). ‘Nkem Akọla m: Ndị Igbo na Asụsụ ha’. Akwụkwọ a gụpụtara na mmemme ncheta ọnwụ nke Chiif Dkt. F.C. Ọgbalu na Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka. Ezeanị, E. (2013). A Philosophy of Education for African Nations. London: Veritas Lumen Nwadike, I.U. (2008). “Igbo Language and Culture: Whither Bound? (Asụsụ na Omenaala Igbo: Ije Aṅaa?) Akwụkwọ a gụpụtara na mmemme ncheta ọnwụ nke Chiif Dkt. F.C. Ọgbalu na Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka. Nwaozuzu, G.I. (2015). “Agbammbọ Ndị Igbo na Nkwalite Asụsụ na Omenaala Ha”. Akwụkwọ a gụpụtara na mmemme ncheta ọnwụ nke Chiif Dkt. F.C. Ọgbalu na Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka. Ohiri-Aniche, C. (2011). “Ọnọdụ Asụsụ Igbo: Oge ugbu a na Ọdịniihu”. Akwụkwọ a gụpụtara na mmemme ncheta ọnwụ nke Chiif Dkt. F.C. Ọgbalu na Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka. Onyeka, C.A. (2008). Behavioural Patterns in Children. Orlu: Chimavin Nig. Ụzọchukwu, S. (2012). “Nhafe Asụsụ na Omenala: Olileanya Ndị Igbo”. Akwụkwọ a gụpụtara na mmemme ncheta ọnwụ nke Chiif Dkt. F.C. Ọgbalu na Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.