“NDOCHI” N’ỤTỌASỤSỤ IGBO

Chinyelu Chikamso Nwosu

Abstract


Isiokwu nchọcha a bụ “Ndochi n’Ụtọasụsụ Igbo” na ụdị ya dị iche iche na etu o si apụta ihe n’ahịrịokwu. “Ndochi” bụ mgbe e ji okwu wee nọchite okwu ọzọ n’ahịrịokwu. Nwanchọcha chọpụtara mkpa ọ dị iji atụ dị iche iche wee kọwaa ụdị ndochi e nwegasịrị n’ụtọasụsụ Igbo. Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ na-eche na “ndochi” na nkwubiri bụ otu mana ha abụghị. Ọ bụ ụdị nghọtahie a kpalitere mmụọ nwanchọcha ime nchọcha n’isiokwu a. Ọ bụ usoro nkọwasị ka a gbasoro wee mee nchọcha a. E webatara atụtụ ụtọasụsụ mgbanwe iji wee nyochaa usoro ndokọokwu dị iche iche nke na-egosi ka “ndochi” si apụta ihe n’ụtọasụsụ Igbo. Nwanchọcha chọpụtara ụdị “ndochi” dị iche iche dị ka “ndochi” ngwaa, “ndochi” mkpọaha na “ndochi” nkebiahịrị, na etu e si eji ha ewube ahịrịokwu. A tụrụ anya na nchọcha a ga-enyere onye maọbụ ndị ọzọ ga-eme nchọcha n’isiokwu a aka n’ọdịniihu. Ọ ga-eme ka onye ọbụla gụrụ ya mụta ọtụtụ ihe dị iche iche gbasara “ndochi” n’ụtọasụsụ Igbo. Nwanchọcha na-atụnye aro ka ndị mmadụ nabata ma gosi mmasị ịga n’ihu ime nchọcha miri emi n’isiokwu a bụ “ndochi” n’ụtọasụsụ Igbo ma bipụta ya n’akwụkwọ ka onye ọ masịrị gụọ ka owee beleta nhịaahụ ndị na-eme nchọcha n’ide isiokwu a na-ezute n’oge ugbu a.

Full Text:

PDF

References


Anagbogụ, P.N., Mbah, B,M & Eme, C.A. (2010). Introduction to linguistics. Awka; Amaka Dreams Chomsky, N. (1957). Syntactic structures. The Hague: Mouton. Comrie, B. (1981). Language universals and linguistics typology. Chicago: The University of Chicago Press Cook, G. (1989). Discourse. London: Oxford University PressEmenanjọ, E. N. (1978). Elements of modern Igbo grammar. Ibadan: Oxford University Press Emenanjọ, E.O., Dike, O.N., Agọmọ, S.N. & Ezeuko, R.O. (2013). Exam Focus Igbo. Ibadan: University Press Elliss, D. G. (1992). From Language to Communication. New Jersey: Lawrence Eribaum Associates, Inc. Halliday, M.A.K. & Hasan, R. (1976). Cohesion in English. London: Longman Mbah, B.M. (2014). Atụtụ Amụmamụ Asụsụ. Enugu: University of Nigeria Press. McCarthy, M (1991). Discourse Analysis for Language Teachers. Cambridge, New York, Melbourne, Port Chester, Sydney: Cambridge University Press. McCarthy, M. & Carter, R. (1994). Language as discourse. London. Longman Quirk, R., Greenbaum, S. Leech, G. & Svartik, J. (1972). A Grammar of contemporary English in literature. An introduction to stylistics. London, New York. Sydney, Auckland: Arnold. Verikaite, D. (1999). Formal and functional characteristics of cohesive device in the science research article in English. PhD dissertation. Vilnius. Vilniaus pedagoginio Universiteto Leidykla. Widdowson, H.G.(2007). Discourse analysis. Oxford: Oxford University Press.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.