“Enyo Jọnal” dịka aha ya siri dị bụ nchịkọta edemede ndị e ji agba n’anwụ, asụsụ, omenaala na nsirihundụ ndị Igbo. Ọ bụ ndị na-agba mbọ ka asụsụ na omenaala Igbo ghara ịnwụ na-esi na jọnal a bụ “enyo” edepụta edemede ha n’asụsụ Igbo kpọmkwem iji kwalite asụsụ na ụzọ ndụ ndị Igbo. Jọnal a na-anabata nchọcha ọbụla e demara edema, hazie nke ọma ma bụrụ ọkpọkọpị nke odee.