EJIJE: ENYO E JI AHỤTA MMEGBU ỤMỤODIBO N’AKWỤKWỌ ERURU N’OGE UGBU A

Ndidi Okey-Agbo, Ebere Ihedigbo

Abstract


Etu mmadụ nwere ike were enyo hụta ihu ya, etu a ka e nwere ike jiri ejije hụta mmegbu ụmụodibo n’ala anyị n’oge ugbu a site na akwụkwọ Eruru. Mmegbu ụmụodibo bụ ihe jọrọ njọ nke ukwu ma n’ihu Chukwu ma n’ihu mmadụ. N’ihi ya, nchọcha a na-eleba anya n’ihe ndị na- ebute ịgba odibo, ụzọ dị iche iche e si emegbu ụmuodibo, dg. Nchọcha a gbadoro ụkwụ n’atụtụ ndoko nke Vladmir Prop. Atụtụ a kwadoro ndokọ ọnụ isiokwu na pụmpụtakwa dị n’agụmagụ ọdịnala. Ngwa nchọcha a bụ site n’akụkọ e dere n’akwụkwọ ejije Eruru, nakwa akwụkwọ ndị ọzọ metụtara isiokwu a. Nchọcha a chọpụtara na; Ụrịọnụ boro Eruru ebubo asị, tie ya ihe ma ziga ya ozi tara akpụ dg. N’ihi ya, ndụmọdụ anyị bụ ka ndị nlekọta ụmụodibo belata ahụhụ ha na-ata ụmụodibo dịka iti ha oke ihe, enyeghị ha nri, ibo ha ebubo dg. E nwere otu bụ “NAPTIP” (National Agency for Prohibition and Trafficking in Persons) nke gọọmenti guzobere ịhụ na atara ndị ọ bụla na-atụ mgbere ụmụaka mana-emegbukwa ha ahụhụ. A gana-akuzi maka nlekọta ụmụodibo ebe niile dịka na ntanetị, ihe onyoonyo televishọn na igwe okwu redio. Ọ dịkwazị mkpa ịkụzi maka nlekọta ụmụodibo na ọgbakọ ndị nne na nna, na na nke ndị nchekwa ndị ọzọ.


Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.