Mwulite nka Okwukwu nye ụmụ Akwụkwọ na-amụ Igbo dịka Asụsụ Epum (Igbo L1): Ntụta Aro ụfọdụ

Nwakaego Nwigwe, Chira Ekwenze

Abstract


N’ edemede a, a kọwasịrị mkpa ọ dị, na obi añụri nke a ga-enweta ma ọ bụrụ na mmadụ mara asụ asụsụ epum ya. Edemede a na-ekwupụta uru dị n’ ịsụ asụsụ epum mmadụ nakwa ihe ọdachị nwere ike ịdapụta nye onye n’enweghi ike isụ asụsụ epum ya. Ọtụtụ ihe omume na egwuregwu ka edemede a tụpụtara dịkà eruro nye ndị nkụzi n’iwulite nka okwukwu  ụmụ akwụkwọ ha. Edemede a gakwara n’ihu kọwa na ihe omume ndị a, a ga-enye ụmụ akwụkwọ ga-abụrụ ha ihe mmepe anya na nkwado n’iwulite nka  okwukwu ha n’ebe asụsụ epum ha dị. Ọ ga-emeka ka ụmụ akwụkwọ nweta nka asụsụ ndị ọzọ dịkà nka ọgụgụ na odịde n’asụsụ epum ha.

Edemede a gakwara n’ihu kọwaa etu ndị nkụzi, ndị nne na nna, ndị isi ụlọ akwụkwọ ga-esi na-ewulite mmasị ụmụ akwụkwọ n’ịmụ nakwa ịsụ asụsụ epum ha. E jikwa ohere a, na-enye ndị nkụzi asụsụ na omenala Igbo ndụmọdụ ka ha tinye uchu ghọtamie ihe omume ndị a, e wepụtasịrị nakwa egwuregwu so ha. Nke a ga-eme ka ha na-akụzipụta kurikulum Igbo dịkà  asụsụ epum (L1) n’ ụlọ akwụkwọ ha dị iche iche na Naijiria


Full Text:

PDF

References


Baker, C. (199). A parent’s and teachers guide to Bilingualism. Philadelphia: Multilingual matters.

Crozier, D.H. and R.M. Blench (1992). An index of Nigerian languages. Dallas, Texas: Summer Institute of Linguistics.

Crow L.D. and Crow A. (1990). Educational psychology: New York. American Book Company.

Cummins, J. (2000). Bilingualism in Education: New York Longman.

Gardner, R. (2005). Language attitude and language learning. E. Bouchard Ryan & H. Giles (Eds) Attitudes towards language variation. Canada, Edward Arnold pp. 132-147.

Krashen, S. (1998). Heritage language development: some practical arguments. In S. Krashen J. Mc Quillan & l. Tse (Eds). Heritage Language development. Culver city. C.A. language Education. Pp, 3-13.

Nwigwe, N. (2011). An assessment of parents’ choice of language to be first acquired by children in Abakaliki Urban. In Ndjoze Ojo R.K. (Eds) International Journal of linguistics and language. Blackwell Educational books.

Ohiri-Aniche, C. (2004). Parents’ choice of language to be first acquired by children in Lagos metropolis. Nigeria. A paper presented at the 24th West African language congress. University of Ibadan, Nigeria.

Richards, J. (1999). The Language Teaching Matrix. Cambridge: Cambridge University Press.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright (c) 2018 Nwakaego Nwigwe, Chira Ekwenze