MMEJU DỊ KA MMEBERE NKEBIOKWU KENGWAA N’ỤTỌASỤSỤ IGBO

Constance Onyinye Amamgbo

Abstract


Nchọcha a lebara anya na mmeju dị ka mmebere nkebiokwu kengwaa n’ụtọasụsụ Igbo. Ihe kpalitere mmụọ nwanchọcha ime nchọcha n’isiokwu a bụ na e nwebeghị ọtụtụ ihe e dere banyere mmeju dị ka mmebere nkebiokwu kengwaa. Ihe nwanchọcha bu n’obi bụ ịchọpụta etu mmeju si enye aka n’ịgbatịkwu mkpụrụokwu. Ịchọpụta ọrụ dị iche iche na ọnọdụ dị iche iche mmeju na-ewegasị n’usorookwu, ọ kachasị ka o siri metụta nkebiokwu kengwaa. Izipụta okwu ndị na-agba ama mmeju. A gbasoro atụtụ mgbanwe nke Chomsky 1957 wee tụlee ebe nkebiokwu kengwaa pụtara ihe n’asụsụ Igbo. Nchọpụta e nwetere gosiri na mmeju so na mmebere nkebiokwu kengwaa. A chọpụtara na ọ bụ na mmeju nkebiokwu ka e si ezipụta nnara, ọdụahịrị na nnapụta. A chọpụtakwara na irighiri okwu anọ ndị a: ‘na, ma, ka, si’ na-agba ama banyere mmeju nkebiokwu kengwaa. Nwanchọcha na-atụ aro ka ndị ọkaasụsụ dị iche iche n’ala anyị na-agba mbọ n’idepụta akwụkwọ ebe a kọwara maka isiokwu a n’asụsụ Igbo etu ọ ga-ekwe nghọta n’egbughị oge.

Full Text:

PDF

References


Agbedo, C. U. (2000). General linguistics: An introductory reader. Nsukka: ACE Resources. Anagbogu, P. N., Mbah, B. M. & Eme, C. A. (2010). Introduction to linguistics (2nd ed.). Awka: Amaka Dreams.

Anyanwu, O. (2008). “Essentials of semantics”, In Mbah, B. M. & Mbah, E. E. (Eds). History of language and communication: Afestschrift in honour of Professor P. A. Nwachukwu. Nsukka: Paschal (pp. 186-201). Cann, R. (1993). Formal semantics: An introduction. Cambridge: Cambridge University Press. Carmie, A. (2007). Syntax: A generative introduction (2nd ed.). Malden: Blackwell Publishing. Chomsky, N. (1957). Syntactic structures. The Hague: Mouton. Cook, U. J. A. & Newson, M. (2009). Chomsky’s generative grammar: An introduction (3rd ed.). Mailden: Blackwell Publishing. Emenanjo, E. N. (2005). Igbo verbs: Transitivity or complementation. In Ndimele O. M. (Ed.), Trends in the study of languages and linguistics in Nigeria, A Festschrift for Philip Akujiobi Nwachukwu. Port Harcourt: Grand Orbit Communication and Emhai Press, pp479-497. Mbah, B. M. (2006). GB Syntax: Theory and application to Igbo. Enugu: St John-Afam Publication. Mbah, B. M. (2008). “On x-bar syntax”, In Mbah, B. M. & Mbah, E. E. (Eds.) History of language and communication. A festschrift in Honour of Prof. P. A. Nwachukwu. Nsukka: Practical Communication.

Mbah, B. M., Mbah, E. E., Ikeokwu, E. G., Okeke, C. O., Nweze, I. M., Ugwuona, C. N., Akaeze, C. M., Onu, J. O., Eze, E. A., Prezi, G. O. & Odii, B. C. (2013). Igbo adị: Igbo English – EnglishIgbo dictionary of linguistics and literary terms. Enugu: University of Nigeria Press. Mbah, B. M. & Mbah, E. E. (2014). Atụtụ amụmamụ asụsụ. Enugu: University of Nigeria Press. Nweya, G. O. (2012). “Mmetụta dị n’etiti usorookwu na echiche n’asụsụ Igbo”. PhD seminar presented to the Departmetn of Igbo, African & Asian Studies, Nnamdi Azikiwe University, Awka. Obiora, T. N. (2004). “The structure of Igbo verb phrase”. A masters thesis submitted to the Department of Igbo, African and Asian Studies, Nnamdi Azikiwe University, Awka. Ofomata, C. E. (2002). Ndezu ụtọasụsụ Igbo ndị juniọ sekọndịrị. Enugu: Format Publishers. Okonkwo, M. N. (1980). A complete course in Igbo grammar. Lagos: Macmillian Publishers. Udemmadu, T. N. (2011). Lecture note on syntax and semantics, Department of Igbo, African & Asian Studies, Nnamdi Azikiwe University, Awka. Udemmadu, T. N. (2014). “Igbo verb phrase in x-bar syntax”. Igbo scholars Journal.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.