Nnyocha Asụsụ Abụ Ekerechi Ederede Igbo a họọrọ-.

Nkoli Mercy Nnyigide, Nkechinyere Anthonia Nwokoye

Abstract


Asụsụ abụ Igbo na-agbagwojukarị ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na ndị ọgụụ agụmagụ Igbo anya. Nchọpụta na-egosi na ọtụtụ ndị ọgụụ na ụmụ akwụkwọ anaghị aghọtacha nkaasụsụ dị iche iche e ji edepụta abụ Igbo, ọkachasị n’abụ ekerechi ederede Igbo. Nke a mere na ọtụtụ n’ime ha kara nwe mmasị na ngalaba iduuazị na ejije Igbo karịa na ngalaba abụ Igbo. N’ederede a, e nyochara asụsụ abụ ekerechi ndị a họọrọ, “Osisi na Ndụ Anyị” na “Abalị”  iji chọpụta etu ndị odeabụ si zipụta nkaasụsụ na nkagụmagụ dị iche iche na ha nakwa ọrụ nka ndị a rụrụ n’ịkwalite nkamma agụmagụ. A gbasoro usoro atụtụ ọdịdị n’ịtule abụ a họọrọ. Site nnyocha e mere, a chọpụtara na ụfọdụ ndị odeabụ Igbo na-ejikarị ọtụtụ nkaasụsụ dabara dabara adaba dịka mmemmadụ, egbeokwu, myiri, kwunkwukwa, mbụrụ, dgz edepụta abụ ha, ọkachasị abụ ekerechi, iji kpalite mmetụtaobi ndị ọgụụ n’ebe gburugburu ha na ihe dị iche iche chukwu okike kere dị. A na-atụ anya na ederede a ga-enye aka mee ka ndị ọgụụ, ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi ghọtawanye asụsụ abụ Igbo ọkachasị abụ ekerechi ederede Igbo.

(The language of Igbo poetry has been posing a serious challenge to some students and readers of Igbo literature. It has been observed that many readers and students do not understand various figurative expressions and literary figures that are employed in Igbo poetry, especially in some poems on natural phenomena. That is why some are more interested in the prose and drama genres than in the poetry genre. In this study, the language of the selected poems, “Osisi na Ndụ Anyị” and “Abalị” was critically examined so as to identify the figurative expressions and literary figures prominent in them and how they contributed in projecting literariness in the selected poems. The study adopts formalistic literary approach in analyzing the selected poems. From the analyses, it is revealed that some Igbo poets employ various figurative expressions such as personification, hyperbole, simile, repetition, metaphor, etc. in their poems especially in poems on natural phenomena, to arouse the feelings and also raise the consciousness of the readers on nature and their environment. It is hoped that through this study, many readers, students and teachers would understand and appreciate the language of Igbo poetry especially that of poems on natural phenomena better).     

 


Full Text:

pdf

References


Abrams, M.H. (2005). A Glossary of Literary Terms. USA: Thomson Higher Education.

Akporobaro, F. B. (2008). Introduction to Poetry, Lagos: Princeton Press.

Anozie, C.C. (2007). Uche bụ Akpa. Onitsha: Varsity Press.

Asika, E.I. (2014). New Perspectives in Poetry. Awka: SCOA Heritage.

Beaty, J., Booth, A., Hunter, J.P. & Mays, K.J. (2002). The Norton Introduction to Literature. New York: www.norton.

Dobie, A. B. (2012) Theory into Practice: An Introduction to Literary Criticism. Boston: Wadsworth.

Ekechukwu, R. M. (Ed). (1975). Akpa Uche. Lagos: Oxford University Press.

Ekwealor, C. (2009) Agụmagụ Ederede Igbo. Nsukka: Paschal Communications.

Emenajo, N. (Ed.) . (1979). Ụtara Ntị. Nigeria: Evans.

Kirszner, L.G., Mandell, S.R. & Fertile, C. (2003).Literature Reading, Reacting, Writing, Canada: Thomson Nelson.

Mbah, B.M., Mbah, E.E. Ikeokwu, E.S., Okeke, C.O., Nweze, I.M., Ugwuona, C.N., Akaeze, C.M., Onu, J.O., Eze, E.A., Prezi, G.O. na Odii, B.C. (2013). Igbo Adị Igbo-English English-Igbo Dictionary of Linguistics and Literary Terms. Nsukka: University of Nigeria Press.

Nwadike, I. U. (1992) Ntọala Agụmagụ. Nigeria: Ịfunanya Publishers.

Nwadike, I. U. (2003) Agụmagụ Ọdịnala Igbo (Igbo Oral Literature). Nimo: Rex Charles & Patrick.

Nwadike, I.U. ( Ed.). (2006). Akọnauche, Obosi, Pacific Publishers.

Uzochukwu, S. (2012). Akanka na Nnyocha Agụmagụ Igbo (Igbo Stylistics and Literary Criticism). Obosi: Pacific Press.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.