A B C D E F G H I J K L M N O P Q R S T U V W X Y Z All
Odezuruigbo Jọnal
Odezuruigbo bụ Jọnal nke Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshịa, Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka. Aha a bụ okwu Igbo nke pụtara “Ihe jezuru ebe niile”. Nke a mere na jọnal a dịka aha ya gosipụtara metụtara mmadụ niile na mba niile. Ebumnuche Odezuruigbo Jọnal hiwere isi n’ime ka a mara na ọ dị mkpa iji asụsụ Igbo depụta edemede nchọcha e nyochara nke ọma. Nke a ga-enye aka n’ịkwalite asụsụ Igbo, ma mee ka ọ na-eto eto. Ọ bụ nke a mere na ọ bụ naanị edemede nchọcha ndị e nyochara nke ọma, ndị e dere n’asụsụ Igbo; ndị ga-akwalite amamihe ka a na-anabata maka ibipụta n’Odezuruigbo Jọnal. A na-anabata edemede na atụmatụ ọbụla metụtara ọdịmma ndị mmadụ, asụsụ, akụkọntọala, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ekpemekpe, azụmahịa, agụmagụ, omenala, agụmakwụkwọ, ọchịchị, nkanaụzụ, dg. Odezuruigbo bụ Jọnal a na-ebipụta kwa afọ.
View Journal | Current Issue | Register